1 Samuel 22

Devid nʼobodo Adulam na Mizpa

1Devid hapụrụ Gat gbaba nʼọgba nkume Adulam. Mgbe ụmụnne ya ndị ikom na ndị ezinaụlọ nna ya nụrụ nke a, ha jekwuru ya nʼebe ahụ. 2Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya.

3Devid sitere nʼebe ahụ jee Mizpa dị na Moab rịọọ eze obodo ahụ sị, “Biko, ị ga-ekwe ka nna m na nne m pụta bịa biri nʼetiti unu tutu ruo mgbe m matara ihe Chineke na-aga imere m?” 4Ya mere, ọ hapụrụ ha ka ha nọdụ na nke eze Moab. Ha na ya nọgidere oge niile Devid bi nʼebe ahụ e wusiri ike.

5Ma Gad onye amụma sịrị Devid, “Anọgidela nʼebe ahụ e wusiri ike, kama laghachi nʼala Juda.” Ya mere, Devid biliri gaa nʼoke ọhịa Heret.

Sọl egbuo ndị nchụaja Nob

6Ugbu a Sọl nụrụ na achọtala ebe Devid na ndị ikom na-eso ya nọ. Sọl, onye ji ùbe ya nʼaka nọdụrụ ala nʼokpuru osisi tamarisk nke dị nʼugwu dị na Gibea. Ndị ozi ya guzokwa gburugburu ya. 7Sọl gwara ha sị, “Geenụ ntị unu ndị ikom Benjamin! Ọ bụ unu niile ka nwa Jesi ga-enye ala ubi na ubi vaịnị? Ọ bụ unu niile ka ọ ga-eme ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha? 8Ọ bụ ya mere unu ji dịnyere ya imegide m? Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu gwara m na nwa m na nwa Jesi gbara ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu ihe gbasara m na-emetụ nʼobi ịgwa m na nwa m nwoke akpaliela ohu m imegide m, ichebiri m nʼụzọ, dịka o mere nʼụbọchị taa.”

9Ma Doeg onye Edọm, onye so ndị ozi Sọl guzo nʼebe ahụ kwuru sị, “Ahụrụ m mgbe nwa Jesi bịakwutere Ahimelek, nwa Ahitub na Nob. 10Ahimelek jụtaara ya ase site nʼaka Onyenwe anyị, ma nyekwa ya ihe oriri na mma agha Golaịat onye Filistia.”

11Mgbe ahụ, eze Sọl zipụrụ ozi nye Ahimelek nwa Ahitub na ndị ezinaụlọ nna ya niile, ndị bụ ndị nchụaja na Nob. Ha niile bịara guzo nʼihu eze. 12Sọl gwara ha okwu sị, “Gee ntị, gị nwa Ahitub.”

Ahimelek zara sị, “Ana m ege ntị, onyenwe m.”

13Sọl jụrụ ya sị, “Gịnị mere gị na nwa Jesi ji gbaa izu imegide m? Gịnị mere i ji nye ya nri na mma agha, jụkwaara ya ase site nʼaka Chineke? Gịnị mere i ji na-agba ya ume ka o nupu isi nʼebe m nọ, na ka ọ bịakwa nʼebe a imegide m taa?”

14Ahimelek zara eze sị, “Onye nʼetiti ndị ohu gị niile bụ onye kwesiri ntụkwasị obi dịka Devid, ọgọ eze, na onyeisi ndị agha na-eche gị nche; ọ bụkwa onye a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu nʼezinaụlọ gị? 15Nke a ọ bụ ụbọchị mbụ m na-ajụrụ ya ase nʼaka Chineke? Ọ bụghị! Ka eze ghara ibo ohu ya na ezinaụlọ nna m ebubo, nʼihi na ohu gị amaghị ihe ọbụla banyere okwu a niile.”

16Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!”

17O nyere ndị na-eso ya iwu sị ha, “Gbuonụ ndị nchụaja ndị a, nʼihi na ha na Devid agbaala izuzu; ha makwa na o si nʼihu m na-agbapụ, ma ha agwaghị m!”

Ma ndị agha eze jụrụ isetipụ aka ha megide ndị nchụaja Onyenwe anyị.

18Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd. 19O ji mma agha jee Nob, obodo ndị nchụaja, gbuo ezinaụlọ ndị nchụaja niile, nwoke na nwanyị, na ụmụntakịrị, na ụmụ na-aṅụ ara. O gbukwara ehi na ịnyịnya ibu na atụrụ ha niile.

20Otu nʼime ụmụ Ahimelek nwa Ahitub, aha ya bụ Abịata gbapụrụ, gbakwuru Devid. 21Ọ gwara Devid na Sọl egbuola ndị nchụaja Onyenwe anyị. 22Mgbe ahụ, Devid sịrị Abịata, “Nʼụbọchị ahụ, mgbe Doeg onye Edọm nọ nʼebe ahụ, amaara m na ọ ghaghị ịgwa Sọl. Mụ onwe m kpatara ọnwụ ndị niile nke ndị ezinaụlọ nna gị. 23Soro m nọdụ nʼebe a, atụla ụjọ, nʼihi na onye na-achọ ndụ gị na-achọkwa ndụ nke m. Mmekpa ahụ ọbụla agaghị adakwasị gị ma mụ na gị nọdụ.”

Copyright information for IboBIU